16Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
17Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke, bụ chi ndị ha na-amaghị, chi ndị ka pụtara ọhụrụ, chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
19Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe.
20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.