44Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.
45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,
46ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.
47Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”
48Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,