48Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
49“Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
50Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha.
51Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.
52Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”