Diuteronomi 4

Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.

Deuteronomy 4:28 (UKJV) And there all of you shall serve gods, the work of men's hands, wood and stone, which neither see, nor hear, nor eat, nor smell.

26ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu.

27Onyenwe anyị ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị ga-achụga unu.

28Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.

29Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.

30Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.