7Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?
8Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?
9Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
10Cheta ụbọchị ahụ unu bịara guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu nʼugwu Horeb, nʼụbọchị ahụ ọ gwara m okwu sị m, “Kpọkọtaa ụmụ Izrel ka ha bịa nʼihu m, nụrụ okwu m, ka ha nwee ike mụta ịtụ m egwu ụbọchị niile nke ha ga-ebi nʼala ahụ, ka ha nweekwa ike ikuziri ụmụ ha.”
11Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị.