9Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
10Ma na-egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
11Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
12Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
13Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile,