Diuteronomi 6

Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.

Deuteronomy 6:15 (UKJV) (For the LORD your God is a jealous God among you) lest the anger of the LORD your God be kindled against you, and destroy you from off the face of the earth.

13Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.

14Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe.

15Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.

16Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.

17Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.