Diuteronomi 6

Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.

Deuteronomy 6:3 (UKJV) Hear therefore, O Israel, and observe to do it; that it may be well with you, and that all of you may increase mightily, as the LORD God of your fathers has promised you, in the land that flows with milk and honey.

1Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.

2Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo.

3Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.

4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.

5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.