Diuteronomi 9

Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi.

Deuteronomy 9:25 (UKJV) Thus I fell down before the LORD forty days and forty nights, as I fell down at the first; because the LORD had said he would destroy you.

23Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.

24Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.

25Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi.

26Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.

27Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.