17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.
18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
19Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.
20Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.