6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.
7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta; mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!”
9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.
10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.