Ndị Efesọs 1

Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.

Ephesians 1:19 (UKJV) And what is the exceeding greatness of his power toward us who believe, according to the working of his mighty power,

17Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,

18ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ.

19Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.

20Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe.

21Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.