Ndị Efesọs 1

Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.

Ephesians 1:2 (UKJV) Grace be to you, and peace, from God our Father, and from the Lord Jesus Christ.

1Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya:

2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.

3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.

4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.