17Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso,
18Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ.
19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke,
20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya.
21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị.