1Ma unu onwe unu, unu nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ na mmehie unu.
2Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi.
3Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya.
4Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ,
5mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.