Ndị Efesọs 3

ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya.

Ephesians 3:17 (UKJV) That Christ may dwell in your hearts by faith; that all of you, being rooted and grounded in love,

15onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha.

16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;

17ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya.

18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi,

19na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.