Ndị Efesọs 3

Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị,

Ephesians 3:20 (UKJV) Now unto him that is able to do exceeding abundantly above all that we ask or think, according to the power that works in us,

18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi,

19na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.

20Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị,

21ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.