Ndị Efesọs 4

Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.

Ephesians 4:16 (UKJV) From whom the whole body fitly joined together and compacted by that which every joint supplies, according to the effectual working in the measure of every part, makes increase of the body unto the edifying of itself in love.

14Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie.

15Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.

16Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.

17Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.

18Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.