19Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.
20Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst,
21ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs.
22Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,
23ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ.