30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
31Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.
32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.