6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.
7Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị.
8Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.”
9(E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ?
10Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)