Ndị Efesọs 5

Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.

Ephesians 5:21 (UKJV) Submitting yourselves one to another in the fear of God.

19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.

20Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

21Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.

22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị.

23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.