Ndị Efesọs 5

Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

Ephesians 5:25 (UKJV) Husbands, love your wives, even as Christ also loved the church, and gave himself for it;

23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.

24Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.

25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha.

27Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.