16Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ.
17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
18Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.
19Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla,
20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.