20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.
21Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile.
22Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume.
23Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna.
24Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.