18Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.
19“Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.
20Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
21Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru.
22O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.