6Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
7E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.
8E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.
9Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.
10Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas,