Esta 2

Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.

Esther 2:10 (UKJV) Esther had not showed her people nor her kindred: for Mordecai had charged her that she should not show it.

8Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze.

9Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.

10Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.

11Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.

12Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.