3Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.
4Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe.
5Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin.
6Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha.
7Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị.