2Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.
3Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?”
4Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu.
5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya.
6Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.