1Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa.
2Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze.
3Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.