Esta 5

Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.

Esther 5:12 (UKJV) Haman said moreover, Yea, Esther the queen did let no man come in with the king unto the banquet that she had prepared but myself; and tomorrow am I invited unto her also with the king.

10Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi ya niile na Zeresh, nwunye ya,

11ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.

12Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.

13Ma ihe ndị a niile bụ ihe efu mgbe ọbụla m na-ahụ Mọdekai onye Juu ahụ ka ọ na-anọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze.”

14Mgbe ahụ, Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile, dụrụ ya ọdụ sị ya, “Ihe ị ga-eme bụ nke a: Kwadoo osisi e ji akwụgbu mmadụ, nke ịdị elu ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Nʼụtụtụ echi, rịọ eze ka o nye gị ike ịkwụgbu Mọdekai nʼelu ya. Mgbe e mere nke a, ọṅụ gị ga-ezukwa oke, mgbe ị ga-esorokwa eze gaa rie oriri a kpọrọ unu.” Okwu a masịrị Heman nke ukwuu. O nyere iwu ka a kwadoo osisi ahụ ngwangwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.