7Esta zara sị, “Arịrịọ m na mkpa m bụ nke a,
8ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.”
9Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.
10Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi ya niile na Zeresh, nwunye ya,
11ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.