8Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.
9Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, “Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe ọ chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman.” Eze sịrị, “Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!”
10Ya mere, ha kwụgburu Heman nʼosisi ahụ ọ kwadoro maka Mọdekai. Iwe eze dajụkwara.