30Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127).
31E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme Purim dịka Mọdekai onye Juu na Esta nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị Juu niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ.
32Iwu a Esta nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme Purim ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ.