18Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?”
19Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”
20Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu.
21Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
22Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”