20Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, o kweghị ka ụmụ Izrel gaa fee Chineke ofufe.
21Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.”
22Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile.
23Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi.
24Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Mosis sị ya, “Gaanụ fee Onyenwe anyị unu ofufe. Unu na ndị inyom na ụmụ unu nwere ike ịga, ma unu ga-ahapụ igwe ehi unu na igwe anụ ụlọ unu gaa.”