Ọpụpụ 10

Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.”

Exodus 10:9 (UKJV) And Moses said, We will go with our young and with our old, with our sons and with our daughters, with our flocks and with our herds will we go; for we must hold a feast unto the LORD.

7Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?”

8Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?”

9Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye Onyenwe anyị.”

10Fero sịrị, “Ka Onyenwe anyị nọnyere unu. Ma agaghị m ekwe ka unu na ndị inyom unu, na ụmụntakịrị unu gaa. O doro anya na unu na-atụ atụmatụ ọjọọ nʼime obi unu.

11Ọ gaghị adị otu a! Jeenụ naanị unu bụ ndị ikom gaa fee Onyenwe anyị unu ofufe, nʼihi na nke a bụ ihe unu na-arịọ.” Mgbe ahụ a chụpụrụ Mosis na Erọn site nʼihu Fero.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.