1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha,
2“Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.
3Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla.
4Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ.