Ọpụpụ 12

Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.

Exodus 12:21 (UKJV) Then Moses called for all the elders of Israel, and said unto them, Draw out and take you a lamb according to your families, and kill the passover.

19Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala.

20Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.”

21Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.

22Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.

23Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.