48“Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.
49Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”
50Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn.
51Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.