9Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn.
10Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo Onyenwe anyị.
11Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt?
12Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.”
13Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ.