Ọpụpụ 16

Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”

Exodus 16:7 (UKJV) And in the morning, then all of you shall see the glory of the LORD; for that he hears your murmurings against the LORD: and what are we, that all of you murmur against us?

5Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”

6Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.

7Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”

8Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”

9Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.