1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.
2Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya
3na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ.