1Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị.
2Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị.
3Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: