1Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị.
2Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ.
3Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto.