9Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya.
10Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”
11Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya.
12Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja.
13Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”