Ọpụpụ 2

Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.”

Exodus 2:6 (UKJV) And when she had opened it, she saw the child: and, behold, the babe wept. And she had compassion on him, and said, This is one of the Hebrews' children.

4Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya.

5Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya.

6Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.”

7Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?”

8Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.