10Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye.
11Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya.
12“Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
13Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ.
14Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.