3Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.
4Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.
5“Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta.
6“Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
7“Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.